Thursday 15 October 2009

AGARACHAA ERUO UYÖ, ONYIJE ATÖ AMA

Igbo n'ekwu n'asioo, na öbialu ije nwe una, na tupu ebu agbaa, öna eburu uzö dua isi na akwu ya, aku fechaa, ödaara awö, Oye gaghrichaa orue ulö, maka na onye ije adighi atö n'uzö. Isi okwu ndia were buru na otee aka madu puru ije, iwu bu na ilaru be nna ya, yaabu ebe amuru ya ga n'aagu ya aguu. Pita Nwanna, n'akwukwö nke odererii gboo nke ökpörö 'Omenukö ököwaputara n'ujuya ihe gbasara okwua. Nihi nkea ödi nkpa ka onye Igbo öbula bi n'uzö, nkea mtutakwara ma ndi nke bi na ngalaba Naijiria ndi özö tunye uche n'okwua site na imata ma ghötakwa na öbu ölu diri ha ihu na ha na adu isi n'ulö, na ha na atu utu diri ha, n'umunna ha, n'umu ögbö ha, nakwa utu obodo. Nke özö wee buru na onye Igbo öbula bi n'uzö, bu ezi onye Igbo ga aghöta nkpa ödi idi newlaru ihe ulö maka iji neta ndu ndi ihapuru wee pua njem.

Ngwanu gerezianu Olu Igbo Bi N'uzö

3 comments:

  1. This comment has been removed by the author.

    ReplyDelete
  2. Umu nna, Ihea unu mebere amaka. Jisie nu ike. Ana m ele anya, na o gaghi adi ka ihe ufudu anyi n'ebido ma hapuru ya ndi ozo. Jisie nu ike.
    Amauchechukwu Nzekwe, US

    ReplyDelete
  3. Amauchechukwu ekele diri gi o. Dika onye bu isi ihe mmemea, ana m ekwe gi nkwa na ogaghi abu ihe emetu-ahapu. Kama na ihe mu nayö bu nkwado ndi Igbo dum bi n'uzö. Ugbua i ga aju olee udi nkwado m' bu n'obi. Ihe di ka idi n'eede ihe onye bu n'uche gbasara isi okwu di iche iche nke anyi luturu aka, özö bu ituta alo maka isiokwu di mkpa irutu aka, nakwa isoro kwuo ma öbu kparita uka. Maka nke ikpazu ihe oye chörö itinye önu n'okwu ga eme bu izitara m akara skype ya na spektric@hotmail.com
    Ya gaziere gi
    Ike Chime

    ReplyDelete