Tuesday 27 October 2009

EGWU EKPILI, (The Igbo griots)

Ekenekwaa m unu ndi nwem. Eji m aka na ihe n'agarai unu nke öma.Isi okwu m chörö ikpa maka ya ugbua bu maka egwu ekpili na uru öbara n'ala Igbo.

Na ngbe gboo n'akuku ödidaanyanwu Afirika, Oke ala gboo bu empaya Mali nwere ndi öka egwu na omenala obodo, bukwa ndi öka ozi eze, na ndi ngbasa ozi site n'egwu ogugu ya na akukö. Aha enyere ndia bu 'Jali, ma öbu 'Griot'. Iwere aka ölu ndi griot tunyere egwuekpili n'ala Igbo iga achöputa na onweghi ihe di iche na ndi Griot na ndi nka egwuekpili ndi Igbo. Nihi nkea anyi nwere ike isi na ndi n'agu egwu ekpili bu ndi griot ndi Igbo. Nka ndi griot bu iji egwu na okwu önu were zie öha ozi; Iji egwu na okwu önu kuziere öha ihe, tumadu ndi n'etolite etolite; Iji egwu na okwu n'akwado omenala; Iji egwu na okwu önu mee öha obi utö.
Ndi griot/egwuekpili bu otu nime ndi n'akwado ma n'echedokwa omenala ka öghara ida.

Egwu ekpili bu egwu eji naani ekpili ja na ngwaegwu mbu Chukwu kere n'uwa, nke bu olu mmadu were naaku na ngbe gboo. Ma n'oge ugbua, ndi n'aaku ja agbanyechaala ötutu ngwa- egwu ndi özi na ya. Egwu ekpili so na otu egwu kara ezi nka n'ala Igbo. Ilee anya ma tulee akukö gbasara Igbo na ebe Igbo siri bido, otu ebe anadi aru aka bu Eri, jaa bu Umunri. Ö bukwa n'aakukua Eri/Nri ya na ögbara ya ka egwu ekpili siri puta. Nkea mere na ndi eji egwu ekpili were mara, bu ndi Igbo akuku ahu. Enugwu - Ukwu, Agulueri, Umuleri, Awkuzu. Nsugbe, Umulum, na ndi özogasi. Nkea mere na ötutu ndi Ökaegwu ekpili n'aala Igbo amaara ama bu n'aakuku obodo ndia gasi ha si. Ndi dika Akunwafö Obiligbo, bu onye enwere ike isi na öbu onye akachaara mara n'egwu ekpili, Okonkwö Asaa, nke a neetu 77, Moroco Maduka, Chukwuemeke Nwansugbe, na ötutu ndi özö, ha nile bu naakuku ala Igbo Eri ka sicha. Nkea n'egosi na egwu ekpili ga eso na egwu Ndiigbo nwere site n'oge mbu.

Ugbua mee onwe gi obioma site n'ige ihe nkea njikötara bu Egwu Epkili.

Udo diri unu

Ike Chime

No comments:

Post a Comment