Wednesday 23 September 2009

IGBO MACHAAANU! IGBO MAKAAANU! IGBO EKENEEM UNOOO!

Ndi nwem, ikpere m n'ala. Ejim oherea n'asi ndu mmiri ndu azu, oke ruwekwe onye öbula ka Chi Ukwu Okike siri dozie ya.


Nkea bu edemede m nke mbu na bulöögi nke m weputara maka 'Olu Ndiigbo, tumadu ndi Igbo bi n'uzö.



Odoro anyi nile anya na ibite aka n'uzö newepu mmadu ihe nahu, odokwara any anya na öbu utu mere achicha ödika obughizi ihe oriri.

Nezie öbughi anya öcha ka anyi jiri hapu be nna anyi ha bu sö mma wee puta na ama ndi öbia na anara nkpari di ya nelu. Ma aganu eji maka mgbagbu ghara ögu. Öbu ahughi ka emere, emee ka ahuru.

N'akwukwö nke odere gboo-gboori, nke ökpörö Omenukö, Peter Nwanna rutura okwua aka ngbe Omenukö kwara ariri gbasara ndu ya n'ala özö maka ngbapu ögbapuru n'ihi ihe aru omere nke bu ire umu mmadu nazuru ya ahia. Oburu na igee igwe okwu anyi iga anu arriri Omenukö a n'uju ya dika Maazi Chimaeze Linus Anyamele siri guputa ya.



Isi okwum were buru na nwa nkpi ga n'agba ösisöö ka öha. Bikonu ka anyi were nwa önödua nke bu Olu Igbo Bi N'uzö were nakpari nkata ma n'egwurikwa egwu, nihi na nkea ga eme ka anyi jiköö aka we mezie ndu anyi.




Agam n'ewetara unu kwa izuka ihe di icheiche na igbeokwu radio nke di ma ilee anya n'aka nri bulöögia. Yaabu pia yabu igwe okwu ma gere ihe di na ya. Igesia inwekwara ike ide ihe bu uche gi gbasara ya.

Asi na anyuköö amiri önu, ögbaa ufufu.


Deemenu Ndinwem.





Ike Chime

8 comments:

  1. Ike Chime Nwanne M,

    Egere m ihe Mz. Oka Oburu Uzo kwuru na okwu ikuku si na Finilandi rute Ndi Igbo bi n'uwa nile nti taa. Obi uto ihe m nuru ka na-egbu m ka mmany. Imeele nke ukwu. Ekelee diri gi maka mbo i na-agba ime ka asusu Igbo na-adigide. O ga-adikwara gi mma.

    Awu m Ticha Akuma-Kalu bi n'Amerika.

    ReplyDelete
  2. Ticha Akuma-Kalu daalu nnaa, Ödim obi utö igu ihe edemede gi. Biko öga asöm ma öburu na iga enwe ike isonye na mmemme ihe ngbasa ozia. Öburu na izitaram akara ozi skype gi ma öburu na inwere ya. Nkea ga enyere aka ime ka isoro tunye önu na mmemmea.
    Zitaram ozi na udechime@gmail.com.
    Ya gaziere gi

    Ike Chime

    ReplyDelete
  3. I do not even understand how I stopped up right here, but I believed this submit was great.
    https://www.motherdayquotesi.com
    motherdayquotesi

    ReplyDelete
  4. Your website is fantastic. The colors and theme are fantastic.
    Are you the one who created this website? Please respond as soon as possible because I'd like to start working on my project.
    I'm starting my blog and I'm curious as to where you got this from or what theme you're using.
    Thank you very much!
    luminar photo editor crack
    apowerpdf crack
    recover my files crack
    microsoft visio pro crack

    ReplyDelete
  5. I really appreciate your clever writing as a design for your blog.
    Is it a payment problem or did you receive it yourself?
    In any case, it is best to stay in writing.
    It's rare to see a webpage as beautiful as this one.
    bitdefender total security crack
    mycleanpc crack
    driver pack solution crack
    tweakbit driver updater crack

    ReplyDelete
  6. This article is very helpful for us, Thanks for sharing. Such a more nice and valuable Article. Really your site is very awesome. Thanks for giving us these kinds of Articles
    Assassin’s Creed Rebellion Crack
    baldurs gate enhanced edition crack

    ReplyDelete
  7. I am very impressed with your post because this post is very beneficial for me and provides new knowledge to me.
    BurnInTest
    Malwarebytes Anti-Exploit
    Microsoft Teams

    ReplyDelete