Tuesday 27 October 2009

EGWU EKPILI, (The Igbo griots)

Ekenekwaa m unu ndi nwem. Eji m aka na ihe n'agarai unu nke öma.Isi okwu m chörö ikpa maka ya ugbua bu maka egwu ekpili na uru öbara n'ala Igbo.

Na ngbe gboo n'akuku ödidaanyanwu Afirika, Oke ala gboo bu empaya Mali nwere ndi öka egwu na omenala obodo, bukwa ndi öka ozi eze, na ndi ngbasa ozi site n'egwu ogugu ya na akukö. Aha enyere ndia bu 'Jali, ma öbu 'Griot'. Iwere aka ölu ndi griot tunyere egwuekpili n'ala Igbo iga achöputa na onweghi ihe di iche na ndi Griot na ndi nka egwuekpili ndi Igbo. Nihi nkea anyi nwere ike isi na ndi n'agu egwu ekpili bu ndi griot ndi Igbo. Nka ndi griot bu iji egwu na okwu önu were zie öha ozi; Iji egwu na okwu önu kuziere öha ihe, tumadu ndi n'etolite etolite; Iji egwu na okwu n'akwado omenala; Iji egwu na okwu önu mee öha obi utö.
Ndi griot/egwuekpili bu otu nime ndi n'akwado ma n'echedokwa omenala ka öghara ida.

Egwu ekpili bu egwu eji naani ekpili ja na ngwaegwu mbu Chukwu kere n'uwa, nke bu olu mmadu were naaku na ngbe gboo. Ma n'oge ugbua, ndi n'aaku ja agbanyechaala ötutu ngwa- egwu ndi özi na ya. Egwu ekpili so na otu egwu kara ezi nka n'ala Igbo. Ilee anya ma tulee akukö gbasara Igbo na ebe Igbo siri bido, otu ebe anadi aru aka bu Eri, jaa bu Umunri. Ö bukwa n'aakukua Eri/Nri ya na ögbara ya ka egwu ekpili siri puta. Nkea mere na ndi eji egwu ekpili were mara, bu ndi Igbo akuku ahu. Enugwu - Ukwu, Agulueri, Umuleri, Awkuzu. Nsugbe, Umulum, na ndi özogasi. Nkea mere na ötutu ndi Ökaegwu ekpili n'aala Igbo amaara ama bu n'aakuku obodo ndia gasi ha si. Ndi dika Akunwafö Obiligbo, bu onye enwere ike isi na öbu onye akachaara mara n'egwu ekpili, Okonkwö Asaa, nke a neetu 77, Moroco Maduka, Chukwuemeke Nwansugbe, na ötutu ndi özö, ha nile bu naakuku ala Igbo Eri ka sicha. Nkea n'egosi na egwu ekpili ga eso na egwu Ndiigbo nwere site n'oge mbu.

Ugbua mee onwe gi obioma site n'ige ihe nkea njikötara bu Egwu Epkili.

Udo diri unu

Ike Chime

Thursday 15 October 2009

AGARACHAA ERUO UYÖ, ONYIJE ATÖ AMA

Igbo n'ekwu n'asioo, na öbialu ije nwe una, na tupu ebu agbaa, öna eburu uzö dua isi na akwu ya, aku fechaa, ödaara awö, Oye gaghrichaa orue ulö, maka na onye ije adighi atö n'uzö. Isi okwu ndia were buru na otee aka madu puru ije, iwu bu na ilaru be nna ya, yaabu ebe amuru ya ga n'aagu ya aguu. Pita Nwanna, n'akwukwö nke odererii gboo nke ökpörö 'Omenukö ököwaputara n'ujuya ihe gbasara okwua. Nihi nkea ödi nkpa ka onye Igbo öbula bi n'uzö, nkea mtutakwara ma ndi nke bi na ngalaba Naijiria ndi özö tunye uche n'okwua site na imata ma ghötakwa na öbu ölu diri ha ihu na ha na adu isi n'ulö, na ha na atu utu diri ha, n'umunna ha, n'umu ögbö ha, nakwa utu obodo. Nke özö wee buru na onye Igbo öbula bi n'uzö, bu ezi onye Igbo ga aghöta nkpa ödi idi newlaru ihe ulö maka iji neta ndu ndi ihapuru wee pua njem.

Ngwanu gerezianu Olu Igbo Bi N'uzö

Wednesday 23 September 2009

IGBO MACHAAANU! IGBO MAKAAANU! IGBO EKENEEM UNOOO!

Ndi nwem, ikpere m n'ala. Ejim oherea n'asi ndu mmiri ndu azu, oke ruwekwe onye öbula ka Chi Ukwu Okike siri dozie ya.


Nkea bu edemede m nke mbu na bulöögi nke m weputara maka 'Olu Ndiigbo, tumadu ndi Igbo bi n'uzö.



Odoro anyi nile anya na ibite aka n'uzö newepu mmadu ihe nahu, odokwara any anya na öbu utu mere achicha ödika obughizi ihe oriri.

Nezie öbughi anya öcha ka anyi jiri hapu be nna anyi ha bu sö mma wee puta na ama ndi öbia na anara nkpari di ya nelu. Ma aganu eji maka mgbagbu ghara ögu. Öbu ahughi ka emere, emee ka ahuru.

N'akwukwö nke odere gboo-gboori, nke ökpörö Omenukö, Peter Nwanna rutura okwua aka ngbe Omenukö kwara ariri gbasara ndu ya n'ala özö maka ngbapu ögbapuru n'ihi ihe aru omere nke bu ire umu mmadu nazuru ya ahia. Oburu na igee igwe okwu anyi iga anu arriri Omenukö a n'uju ya dika Maazi Chimaeze Linus Anyamele siri guputa ya.



Isi okwum were buru na nwa nkpi ga n'agba ösisöö ka öha. Bikonu ka anyi were nwa önödua nke bu Olu Igbo Bi N'uzö were nakpari nkata ma n'egwurikwa egwu, nihi na nkea ga eme ka anyi jiköö aka we mezie ndu anyi.




Agam n'ewetara unu kwa izuka ihe di icheiche na igbeokwu radio nke di ma ilee anya n'aka nri bulöögia. Yaabu pia yabu igwe okwu ma gere ihe di na ya. Igesia inwekwara ike ide ihe bu uche gi gbasara ya.

Asi na anyuköö amiri önu, ögbaa ufufu.


Deemenu Ndinwem.





Ike Chime