Wednesday 23 September 2009

IGBO MACHAAANU! IGBO MAKAAANU! IGBO EKENEEM UNOOO!

Ndi nwem, ikpere m n'ala. Ejim oherea n'asi ndu mmiri ndu azu, oke ruwekwe onye öbula ka Chi Ukwu Okike siri dozie ya.


Nkea bu edemede m nke mbu na bulöögi nke m weputara maka 'Olu Ndiigbo, tumadu ndi Igbo bi n'uzö.



Odoro anyi nile anya na ibite aka n'uzö newepu mmadu ihe nahu, odokwara any anya na öbu utu mere achicha ödika obughizi ihe oriri.

Nezie öbughi anya öcha ka anyi jiri hapu be nna anyi ha bu sö mma wee puta na ama ndi öbia na anara nkpari di ya nelu. Ma aganu eji maka mgbagbu ghara ögu. Öbu ahughi ka emere, emee ka ahuru.

N'akwukwö nke odere gboo-gboori, nke ökpörö Omenukö, Peter Nwanna rutura okwua aka ngbe Omenukö kwara ariri gbasara ndu ya n'ala özö maka ngbapu ögbapuru n'ihi ihe aru omere nke bu ire umu mmadu nazuru ya ahia. Oburu na igee igwe okwu anyi iga anu arriri Omenukö a n'uju ya dika Maazi Chimaeze Linus Anyamele siri guputa ya.



Isi okwum were buru na nwa nkpi ga n'agba ösisöö ka öha. Bikonu ka anyi were nwa önödua nke bu Olu Igbo Bi N'uzö were nakpari nkata ma n'egwurikwa egwu, nihi na nkea ga eme ka anyi jiköö aka we mezie ndu anyi.




Agam n'ewetara unu kwa izuka ihe di icheiche na igbeokwu radio nke di ma ilee anya n'aka nri bulöögia. Yaabu pia yabu igwe okwu ma gere ihe di na ya. Igesia inwekwara ike ide ihe bu uche gi gbasara ya.

Asi na anyuköö amiri önu, ögbaa ufufu.


Deemenu Ndinwem.





Ike Chime